Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 28:18-24 Bible Nso (IGBOB)

18. Ndi Filistia batakwara n'obodo nile nke ebe di ala ala, na nke Negeb nke diri Juda, ha were kwa Bet-shemesh, na Ajalon, na Gedirot, na Soko na umu-obodo-ya, na Timna na umu-obodo-ya, na Gimzo na umu-obodo-ya: ha we biri n'ebe ahu.

19. N'ihi na Jehova mere ka Juda ruru ala, n'ihi Ehaz, bú eze Israel; n'ihi na o mere ka Juda ghara idi nchikọta, o we mekpu emekpu nke-uku megide Jehova.

20. Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, we biakute ya, kpab͕ue ya, ma o meghi ya ka ọ di ike.

21. N'ihi na Ehaz kère ulo Jehova, na ulo eze na ndi-isi, nye eze Asiria òkè: ma ọ bughi ihe yere ya aka.

22. Ma na mb͕e nkpab͕u ahu akpab͕uru ya, o mekpuru emekpu kari imegide Jehova, bú eze Ehaz nka.

23. O we chuara chi nile nke Damaskọs àjà, bú ndi tib͕uru ya: ọ si, N'ihi na chi nke ndi-eze Siria nēyere ha aka, ndi ahu ka m'gāchuru àjà, ka ha we yerem aka. Ma chi ahu buru ya, bu-kwa-ra Isarel nile, ihe mere ka ọ su ngọngọ.

24. Ehaz we chikọta ihe nile nke ulo Chineke, b͕u ngwongwo ihe nile nke ulo Chineke, mechie ọnu-uzọ nile nke ulo Jehova, mere onwe-ya ebe-ichu-àjà di iche iche nime nkuku nile nime Jerusalem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 28