Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 28:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Orú arọ ka Ehaz b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: ma o meghi ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika Devid nna-ya:

2. kama o jere ije n'uzọ nile nke ndi-eze Israel, ọzọ kwa, o mere arusi awuru awu nye Bealim.

3. Onye ahu sure-kwa-ra ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ nime ndagwurugwu nwa Hinom, sure kwa umu-ya n'ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.

4. Ọ chua aja, sure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu, na n'elu ugwu ntà nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula.

5. Jehova, bú Chineke-ya, we nye ya n'aka eze Siria; ha we tib͕ue ya, si nime ndi-ya dọta ndọta-n'agha uku, me ka ha biarue Damaskọs. Ọzọ kwa, n'aka eze Israel ka enyere ya, o we tib͕ue ya oké ntib͕u.

6. Peka nwa Remalaia b͕uru nime Juda orú nnù ndikom uzọ iri-na-ise n'otù ubọchi, ha nile bu ndi-dìnkpà; n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.

7. Zikri, bú dike nke Efraim, we b͕ue Maaseia nwa eze, na Azrikam, bú onye-ndú nke ulo, na Elkena nke bu-kwa-ra eze dika onye nke-abua.

8. Umu Israel we dọta n'agha nime umu-nne-ha orú nnù madu orú uzọ na uzọ ise, bú ndinyom, na umu-ndikom, na umu-ndinyom, ọzọ kwa, ọtutu ihe-nkwata ka ha lutara n'aka-ha n'agha, ha we webata ihe-nkwata ahu na Sameria.

9. Ma otù onye-amuma Jehova nọ n'ebe ahu, Oded bu aha-ya: ọ pua izute usu-ndi-agha ahu nke nābiaru Sameria, ọ si ha, Le, ọ bu n'ihi na Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, kosara Juda ọnuma, ka O nyere ha n'aka-unu, unu we were ọnuma nke ruru elu-igwe b͕ue ha.

10. Ma ub͕u a unu onwe-unu nāsi na unu gāzọda umu Juda na Jerusalem ka ha ghọrọ unu ndi-orù na ndinyom nēje ozi: ma unu onwe-unu, ìhe ikpe-ọmuma adighi kwa n'etiti unu n'ebe Jehova, bú Chineke-unu, nọ?

11. Ma ub͕u a nurunum, zighachi ndọta-n'agha ahu, nke unu dọtara n'agha site n'umu-nne-unu: n'ihi na iwe di ọku nke Jehova di n'aru unu.

12. Ndikom ufọdu nime ndi-isi umu Efraim, bú Azaraia nwa Jehohanan, na Berekaia nwa Meshilemot, na Jehizkia na Shalum, na Amasa nwa Hadlai, we bilie imegide ndi nēsi n'usu-ndi-agha bia,

13. ha we si ha, Unu agaghi-ewebata ndọta-n'agha ahu n'ebe a: n'ihi na tukwasi ikpe-ọmuma Jehova nke mara ayi, unu onwe-unu nāsi na unu gātukwasi ihe na nmehie nile ayi na n'ikpe-ọmuma-ayi: n'ihi na o riri nne, bú ikpe-ọmuma mara ayi, iwe di ọku di kwa n'aru Israel.

14. Ndi ejikere agha we rapu ndọta-n'agha ahu na ihe-nluta-n'agha ahu n'iru ndi-isi na nkpọkọta ahu nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 28