isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 27 Bible Nso (IGBOB)

1. Orú arọ na ise ka Jotam b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jerusha nwa-nwayi Zedok.

2. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Uzaia nna-ya mere: nání na ọ baghi n'ulo uku Jehova. Ma ndi Juda nọ nēbibi onwe-ha.

3. Onye ahu wuru ọnu-uzọ-ama ulo Jehova nke di n'elu, o wu-kwa-ra ulo n'uba n'elu mb͕idi Ofel.

4. O wu-kwa-ra obodo ufọdu n'ugwu Juda, wu kwa ulo uku na ulo-elu n'oké ọhia.

5. Onye ahu buso-kwa-ra eze umu Amon agha, we ka ha ike. Umu Amon we nye ya n'arọ ahu ọgu talent ọla-ọcha ise, na orú nnù cor ọka wheat na nnù ise, na orú nnù cor ọka barley na nnù ise. Nka ka umu Amon nyeghachiri ya, n'arọ nke-abua kwa, na n'arọ nke-atọ.

6. Jotam we me onwe-ya ka ọ di ike, n'ihi na o doziri uzọ-ya nile n'iru Jehova, bú Chineke-ya.

7. Ma ihe nile nke Jotam mere nke fọduru, na agha-ya nile, na uzọ-ya nile, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Israel na Juda.

8. Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem.

9. Jotam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'obodo Devid: Ehaz nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.