Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 25:8-12 Bible Nso (IGBOB)

8. Otú ọ di, gi onwe-gi bia, me ihe, di ike ibu agha: Chineke gēme ka i ghara iso ngọngọ n'iru onye-iro-gi; n'ihi na ike di nime Chineke iye aka na ime ka asu ngọngọ.

9. Amazaia we si onye nke Chineke ahu, Ma gini ka ayi gēme bayere ọgu talent ise ahu nke m'nyeworo usu ndi nāpunara madu ihe nke Israel? Onye nke Chineke we si, Jehova nwere ihe inye gi nke bara uba kari.

10. Amazaia we kewapu ha, bú usu ndi nāpunara madu ihe nke siri n'Efraim biakute ya, ka ha laghachi n'ebe-ha: iwe-ha we di ọku nke-uku megide Juda, ha we laghachi n'ebe-ha n'iwe di ọku.

11. Amazaia we me onwe-ya ka ọ di ike, o we duru ndi-ya, je Ndagwurugwu Nnù, tib͕ue umu Sia, orú nnù ndikom na nnù ise.

12. Ma orú nnù ndikom na nnù ise ọzọ ndi di ndu, umu Juda dọtara ha n'agha, me ka ha bia n'elu nkume di elu, ha we si n'elu nkume di elu ahu tuda ha, ewe tupia ha nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 25