Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 25:14-20 Bible Nso (IGBOB)

14. O rue, mb͕e Amazaia latara site na ntib͕u ndi Edom, na ọ chibatara chi nke umu Sia, guzoro ha onwe-ya ibu chi, we kpọ isi ala n'iru ha, surere ha ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ.

15. Iwe Jehova we di ọku imegide Amazaia, o we zigara ya onye-amuma, nke siri ya, N'ìhi gini ka i chọworo chi nke ndi ahu, ndi nānaputaghi ndi-ha n'aka-gi?

16. O rue, mb͕e ọ nāgwa ya okwu, na eze siri ya, Ọ̀ bu iburu eze onye nādu ọdu ka ayi meworo gi? ra aka; n'ìhi gini ka agētib͕u gi? Onye-amuma ahu we ra aka, si, Amawom na Chineke ezubewo ibibi gi, n'ihi na i mewo nka, i geghi kwa idu-ọdum nti.

17. Amazaia, bú eze Juda, we nara idu-ọdu, zigara Joash nwa Jehoahaz, nwa Jihu, bú eze Israel, ozi, si, Bia, ka ayi lerita onwe-ayi anya n'iru.

18. Joash, bú eze Israel, we zigara Amazaia, bú eze Juda, ozi, si, Uke nke di na Lebanon zigara osisi cedar nke di na Lebanon ozi, si, Nye nwam nwoke nwa-gi nwayi na nwunye: anu-ọhia nke di na Lebanon we gabiga, zọpia uke ahu.

19. I siwo, Le, i tib͕uwo Edom; obi-gi we bulie gi elu isọpuru onwe-gi: ub͕u a nọdu n'ulo-gi; n'ìhi gini ka i nākpali onwe-gi n'ihe ọjọ, ka i we da, gi onwe-gi, na Juda soro gi?

20. Ma Amazaia anughi; n'ihi na Chineke ka o sitere, ka O we nye ha n'aka ndi-iro-ha, n'ihi na ha chọrọ chi Edom.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 25