Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 25:13-17 Bible Nso (IGBOB)

13. Ma ndikom nke usu ndi nāpunara madu ihe nke Amazaia zilagara, ka ha ghara iso ya je agha, madere n'obodo nile nke Juda, site na Sameria we rue Bet-horon, tib͕ue nnù madu asa na ọgu iri nime ha, luta ihe-nluta bara uba n'agha.

14. O rue, mb͕e Amazaia latara site na ntib͕u ndi Edom, na ọ chibatara chi nke umu Sia, guzoro ha onwe-ya ibu chi, we kpọ isi ala n'iru ha, surere ha ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ.

15. Iwe Jehova we di ọku imegide Amazaia, o we zigara ya onye-amuma, nke siri ya, N'ìhi gini ka i chọworo chi nke ndi ahu, ndi nānaputaghi ndi-ha n'aka-gi?

16. O rue, mb͕e ọ nāgwa ya okwu, na eze siri ya, Ọ̀ bu iburu eze onye nādu ọdu ka ayi meworo gi? ra aka; n'ìhi gini ka agētib͕u gi? Onye-amuma ahu we ra aka, si, Amawom na Chineke ezubewo ibibi gi, n'ihi na i mewo nka, i geghi kwa idu-ọdum nti.

17. Amazaia, bú eze Juda, we nara idu-ọdu, zigara Joash nwa Jehoahaz, nwa Jihu, bú eze Israel, ozi, si, Bia, ka ayi lerita onwe-ayi anya n'iru.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 25