Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 25:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Amazaia b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iteghete nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jehoadan nke Jerusalem.

2. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, nání na o weghi obi zuru okè me ya.

3. O rue, mb͕e ala-eze di ike n'ebe ọ nọ, na o b͕uru ndi-orú-ya ndi tib͕uru eze, bú nna-ya.

4. Ma o meghi ka umu-ha nwua, kama o mere dika ihe edeworo n'iwu n'akwukwọ Moses, nke Jehova nyere n'iwu, si, Ndi bu nna agaghi-anwu n'ọnọdu umu-ha, umu agaghi-anwu kwa n'ọnọdu ndi bu nna-ha; kama onye ọ bula gānwu nime nmehie nke aka ya.

5. Amazaia we chikọta Juda, guzo ha dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, nye ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, nye kwa ndi-isi usu ọgu ndikom ise, bú Juda na Benjamin nile: o we gukọta ha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, o we hu na ha di orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nāpukuru usu-ndi-agha, ndi nēji ube na ọta.

6. O we were ọgu talent ọla-ọcha ise go orú nnù ndikom uzọ iri-na-abua na nnù iri, ha bu ndi-dike bu dìnkpà, site n'Israel.

7. Ma onye nke Chineke biakutere ya, si, Eze, ka usu-ndi-agha Israel ghara iso gi bia; n'ihi na Jehova anọyeghi Israel, bú umu nile nke Efraim.

8. Otú ọ di, gi onwe-gi bia, me ihe, di ike ibu agha: Chineke gēme ka i ghara iso ngọngọ n'iru onye-iro-gi; n'ihi na ike di nime Chineke iye aka na ime ka asu ngọngọ.

9. Amazaia we si onye nke Chineke ahu, Ma gini ka ayi gēme bayere ọgu talent ise ahu nke m'nyeworo usu ndi nāpunara madu ihe nke Israel? Onye nke Chineke we si, Jehova nwere ihe inye gi nke bara uba kari.

10. Amazaia we kewapu ha, bú usu ndi nāpunara madu ihe nke siri n'Efraim biakute ya, ka ha laghachi n'ebe-ha: iwe-ha we di ọku nke-uku megide Juda, ha we laghachi n'ebe-ha n'iwe di ọku.

11. Amazaia we me onwe-ya ka ọ di ike, o we duru ndi-ya, je Ndagwurugwu Nnù, tib͕ue umu Sia, orú nnù ndikom na nnù ise.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 25