Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 24:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Joash b͕ara arọ asa mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na Jerusalem: aha nne-ya bu Zibia nke Bia-sheba.

2. Joash we me ihe ziri ezi n'anya Jehova ubọchi nile nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà.

3. Jehoiada we lutara ya ndinyom abua; o we mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

4. O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na ọ di n'obi Joash ime ka ulo Chineke di ọhu.

5. O we chikọta ndi-nchu-àjà na ndi Livai, si ha, Puanu, jerue obodo nile nke Juda, chikọputa ego n'Israel nile ime ka ulo Chineke-unu di ike kwa-arọ, unu onwe-unu kwa, menu ngwa ime ihe ahu. Ma ndi Livai emeghi ngwa.

6. Eze we kpọ Jehoiada, bú onye-isi, si ya, Gini mere i jughi ndi Livai ka ha si na Juda, si kwa na Jerusalem, webata ùtú nke Moses, bú orù Jehova, na nke nkpọkọta nke Israel, nke diri ulo-ikwū ihe-àmà?

7. N'ihi na Atalaia, bú nwayi ahu nēmebi iwu, umu-ya ndikom tipúru ulo Chineke; ọzọ kwa, ha were ihe nsọ nile nke ulo Jehova nye Bealim.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 24