Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 23:2-5 Bible Nso (IGBOB)

2. Ha we nāga buruburu nime Juda, chikọputa ndi Livai n'obodo nile nke Juda, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, ha we biarue Jerusalem.

3. Nkpọkọta ahu nile na eze we b͕a ndu n'ulo Chineke. Ọ si ha, Le, nwa eze gābu eze, dika Jehova kwuworo bayere umu Devid.

4. Nka bu ihe unu gēme: otù uzọ n'uzọ atọ nime unu, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, bú nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai, gābu ndi-ọnu-uzọ-ama nke nbata-uzọ nile;

5. otù uzọ n'uzọ atọ gānọ kwa n'ulo eze, otù uzọ n'uzọ atọ kwa n'ọnu-uzọ-ama nke ntọ-ala: ndi Juda nile gānọ kwa n'ogige ulo Jehova nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 23