Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 23:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma n'arọ nke-asa Jehoiaba mere onwe-ya ka ọ di ike, o we chita ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, bú Azaraia nwa Jehoram, na Ishmael nwa Jehohanan, na Azaraia nwa Obed, na Maaseia nwa Adaia, na Elishafat nwa Zikri, me ka ya na ha b͕a ndu.

2. Ha we nāga buruburu nime Juda, chikọputa ndi Livai n'obodo nile nke Juda, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, ha we biarue Jerusalem.

3. Nkpọkọta ahu nile na eze we b͕a ndu n'ulo Chineke. Ọ si ha, Le, nwa eze gābu eze, dika Jehova kwuworo bayere umu Devid.

4. Nka bu ihe unu gēme: otù uzọ n'uzọ atọ nime unu, bú ndi nābà nime n'ubọchi-izu-ike, bú nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai, gābu ndi-ọnu-uzọ-ama nke nbata-uzọ nile;

5. otù uzọ n'uzọ atọ gānọ kwa n'ulo eze, otù uzọ n'uzọ atọ kwa n'ọnu-uzọ-ama nke ntọ-ala: ndi Juda nile gānọ kwa n'ogige ulo Jehova nile.

6. Ma ka onye ọ bula ghara ibà n'ulo Jehova, ọ bu nání ndi-nchu-àjà, na ndi n'etiti ndi Livai ndi nēje ozi; ndi ahu gābà, n'ihi na ndi nsọ ka ha bu: ma ndi Juda nile gēdebe ihe-ndebe ulo Jehova.

7. Ndi Livai gānọ kwa eze buruburu, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya; ma onye nābata n'ulo, ka eme ka ọ nwua: unu nọye-kwa-ra eze mb͕e ọ nābà nime, na mb͕e ọ nāpu n'èzí.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 23