Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 21:9-13 Bible Nso (IGBOB)

9. Jehoram we gabiga, ya na ndi-isi-ya, ub͕ọ-ala-ya nile so-kwa-ra ya: o rue na o biliri n'abali, tib͕ue Edom ndi nāb͕a ya buruburu, ha na ndi-isi ub͕ọ-ala.

10. Edom we si n'okpuru aka Juda jehie, rue ta: mb͕e ahu ka Libna siri n'okpuru aka-ya jehie n'otù mb͕e ahu: n'ihi na ọ rapuru Jehova, bú Chineke nke nna-ya-hà.

11. Onye ahu me-kwa-ra ebe di elu n'ugwu nile nke Juda, we me ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, ọ rafu-kwa-ra Juda.

12. Odide-akwukwọ we si n'aka Elaija, bú onye-amuma, biakute ya, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Devid nna-gi, siri, N'ihi na i jeghi ije n'uzọ nile nke Jehoshafat nna-gi, ma-ọbu n'uzọ nile nke Esa, bú eze Juda;

13. kama i jewo ije n'uzọ ndi-eze Israel, me Juda na ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, dika ulo Ehab mere ka akwa iko; ọzọ kwa, umu-nne-gi ndikom, bú ulo nna-gi, ndi di nma kari gi onwe-gi, ka i b͕uworo:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 21