1. Jehoshafat we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Jehoram nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya.
2. O nwe-kwa-ra umu-nne-ndikom, bú umu Jehoshafat, aha-ha bu Azaraia, na Jehiel, na Zekaraia, na Azaraia, na Maikael, na Shefataia: ndia nile bu umu-ndikom Jehoshafat, bú eze Israel.
3. Nna-ha we nye ha ọtutu onyinye, nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ihe di oké ọnu-ahia, ha na obodo ewusiri ike nime Juda: ma ala-eze ka o nyere Jehoram, n'ihi na onye ahu bu ọkpara.
4. Jehoram we bilie ibu onye-isi ala-eze nna-ya, o we me onwe-ya ka ọ di ike, were mma-agha b͕ue umu-nne-ya ndikom nile, ọzọ kwa, o b͕uru ufọdu nime ndi-isi Israel.
5. Orú arọ na iri na abua ka Jehoram b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ asatọ na Jerusalem.
6. O je ije n'uzọ ndi-eze Israel, dika ulo Ehab mere: n'ihi na ọ bu nwa-nwayi Ehab ka ọ nwere na nwunye: o we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.
7. Ma Jehova ekweghi ibibi ulo Devid, n'ihi ọb͕ub͕a-ndu ahu Ya na Devid mere, dika Ọ si-kwa-ra na Ọ gēnye ya oriọna, nye kwa umu-ya, ubọchi nile.