23. Umu Amon na Moab we guzo imegide ndi bi n'ugwu Sia, iwezuga ha ka ebibie ha na ikpochapu ha: mb͕e ha mere ka ndi bi na Sia gwusia, ha we yere onwe-ha aka, nwoke na ibe-ya, ibibi onwe-ha.
24. Juda we biarue ulo-nche, rue ọzara, ha we le ìgwè madu ahu anya; ma, le, ha bu ozu ozu daworo n'ala, ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu.
25. Jehoshafat na ndi-ya we bia iluta ihe-nkwata-ha n'agha, ha we hu n'etiti ha ma àkù ma ozu ma ihe di oké ọnu-ahia n'uba, ha we napusia onwe-ha ihe, kari nke ha nwere ike ibū: ha we nọ ubọchi atọ nāluta ihe-nkwata n'agha, n'ihi na ihe bara uba ka ọ bu.
26. Ma n'ubọchi nke-anọ ha kpọkọtara onwe-ha na ndagwurugwu Beraka; n'ihi na n'ebe ahu ka ha gọziri Jehova: n'ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu, Ndagwurugwu Bekara, rue ta.
27. Ha we lata, nwoke ọ bula nke Juda na Jerusalem, Jehoshafat nāga kwa n'iru ha, iwere ọṅù lata na Jerusalem; n'ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu n'iru ndi-iro-ha.
28. Ha we chiri une, na ubọ-akwara, na opì, biarue Jerusalem rue ulo Jehova.
29. Oké egwu Chineke we dikwasi ala-eze nile nke ala nile ọzọ, mb͕e ha nuru na Jehova busoro ndi-iro Israel agha.
30. Ala-eze Jehoshafat we di jū: n'ihi na Chineke-ya mere ka o zuru ike buruburu.
31. Jehoshafat we buru eze Juda: ọ b͕ara orú arọ na iri na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na ise nime Jerusalem: aha nne-ya bu Azuba nwa-nwayi Shilhi.