Ha we bilie n'isi-ututu, pua ba n'ọzara Tekoa: ma mb͕e ha nāpu, Jehoshafat guzoro, si, Nurunum, Juda, na ndi bi na Jerusalem; kwerenu na Jehova, bú Chineke-unu, unu gēkwesi kwa ntukwasi-obi; kwerenu na ndi-amuma-Ya, ihe gāga-kwa-ra unu nke-ọma.