Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 2:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Solomon we si na o gēwuru aha Jehova ulo, wu-kwa-ra ala-eze-ya ulo.

2. Solomon we guta orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise, bú ndi-ibu, na orú nnù ndikom uzọ iri ndi nāwa ihe-ọwuwa n'ugwu, na nnù ndikom iteghete ndi edoro ndi-isi-ha.

3. Solomon we zigara Huram, bú eze Taia, ozi, si, Otú i mere Devid nnam, we zitere ya osisi cedar iwuru ya ulo ibi nime ya, me-kwa-ram otú a.

4. Le, mu onwem nēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, idoro Ya nsọ, isure n'iru Ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na idebe n'ebe ahu achicha anēdo n'usoro mb͕e nile, na isure àjà-nsure-ọku n'ututu na n'anyasi, na n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú Chineke-ayi. Rue mb͕e ebighi-ebi ka nka dikwasi Israel.

5. Ma ulo nke mu onwem nēwu di uku, n'ihi na Chineke-ayi di uku kari chi nile.

6. Ma ònye nwere ike iwuru Ya ulo, n'ihi na elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe nāgaghi-anagide Ya? ònye kwa ka mu onwem bu, na m'gēwuru Ya ulo, ma-ọbughi nání isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Ya?

7. Ma ub͕u a ziterem otù nwoke mara ihe n'ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, na n'ígwè, na n'ogho ododo na ogho uhie na ogho anunu, onye ma-kwa-ra iso ndi mara ihe, ndi nọ n'ebe m'nọ na Juda na nime Jerusalem, bú ndi Devid nnam doziri, b͕u eb͕ub͕u.

8. Si kwa na Lebanon ziterem osisi cedar, na osisi fir, na osisi algum: n'ihi na mu onwem amawo na ndi-orù-gi mara ib͕utu osisi nime Lebanon; ma, le, ndi-orùm gēso kwa ndi-orù-gi,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 2