Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 19:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehoshafat, bú eze Juda, we laghachi n'ulo-ya n'udo, rue Jerusalem.

2. Jihu nwa Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, we pua izute ya, ọ si eze, bú Jehoshafat, Ò kwesiri gi iyere onye nēmebi iwu aka? ọ̀ bu kwa ndi nākpọ Jehova asì ka i nāhu n'anya? ma n'ihi ihe a iwe dikwasi gi site n'iru Jehova.

3. Otú ọ di, achọtawo ezi ihe n'aka-gi, n'ihi na i mewo ka Asherot si n'ala nka gabiga, i we dozie obi-gi ichọ Chineke.

4. Jehoshafat we biri na Jerusalem: o we jeghachi pua jegharia n'etiti ndi-ya site na Bia-sheba rue ugwu Efraim, me ka ha laghachikute Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 19