Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 18:9-12 Bible Nso (IGBOB)

9. Ma eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, nānọkwasi, nwoke ọ bula n'oche-eze-ya, yiri uwe-ha, ha we nọdu n'ebe-nzọcha-ọka n'oghere ọnu-uzọ-ama Sameria; ndi-amuma nile nēbu kwa amuma n'iru ha.

10. Zedakaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia.

11. Ndi-amuma nile nēbu kwa amuma otú a, si, Rigorue Remot-gilead, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma: Jehova enyewo kwa ya n'aka eze.

12. Ma onye-ozi ahu nke jere ikpọ Maikaia gwara ya okwu, si, Le, okwu nile nke ndi-amuma, dika otù ọnu, nēkwuru eze ezi ihe: biko, ka okwu-gi di kwa ka okwu otù onye nime ha, gi kwu kwa ezi ihe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 18