9. Ha we zí ihe na Juda, nēji akwukwọ iwu Jehova n'aka-ha; ha we nēje obodo nile nke Juda buruburu, we nēzí ihe n'etiti ndi Juda.
10. Oké egwu Jehova we dikwasi ala-eze nile nke ala nile nke di Juda buruburu, ha ebusoghi kwa Jehoshafat agha.
11. Ufọdu nime ndi Filistia weta-kwa-ra Jehoshafat onyinye-inata-iru-ọma, na ọla-ọcha òfùfè; ndi Arebia nēweta-kwa-ra ya ìgwè ewu na aturu, nnù ebulu iri-na-iteghete na ọgu ise, na nnù nkpi iri-na-iteghete na ọgu ise.
12. Jehoshafat we nāga n'iru we di ike ri nne; o we wue nime Juda ulo uku na obodo nchikọbata-ihe.
13. O nwe-kwa-ra ije-ozi bara uba n'obodo Juda nile, na ndikom agha nime Jerusalem, ha bu ndi-dike bu dìnkpà.