Ma na mb͕e ahu Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, biakutere Esa, bú eze Juda, si ya, N'ihi na i dabeworo n'eze Siria, ma i dabeghi na Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi nka usu-ndi-agha eze Siria esiwo n'aka-gi wepuga onwe-ya.