Ha we lìe ya n'ili ya, nke o gwuwara nye onwe-ya n'obodo Devid, ha we me ka o dina n'ihe-ndina nke emejuru n'uda di iche iche na ihe di iche iche asugwara asugwa n'ọlu onye nāsugwa manu nēsì ísì utọ: ha we surere ya oké nsure-ọku di uku.