1. Abaija we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'obodo Devid: Esa nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya: ala di jū n'ubọchi-ya arọ iri.
2. Esa we me ezi ihe nke zi-kwa-ra ezi n'anya Jehova, bú Chineke-ya:
3. o we wezuga ebe-ichu-àjà nile nke ala ọzọ, na ebe nile di elu, tupia ogidi nile, b͕utue Asherim;
4. ọ si Juda ka ha chọ Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, na ime iwu na ihe enyere n'iwu.
5. O si-kwa-ra n'obodo nile nke Juda wezuga ebe nile di elu na arusi-anyanwu nile: ala-eze-ya we di jū n'iru ya.
6. O we wue obodo ewusiri ike nime Juda: n'ihi na ala di jū, ọ dighi kwa agha o nwere n'arọ ndia; n'ihi na Jehova mere ka o zuru ike.