Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 13:18-22 Bible Nso (IGBOB)

18. Ewe weda umu Israel n'ala na mb͕e ahu, umu Juda we b͕a ume, n'ihi na ha dabere na Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.

19. Abaija we chuso Jeroboam, nara ya obodo, bú Bet-el na umu-obodo-ya, na Jeshana na umu-obodo-ya, na Efron na umu-obodo-ya.

20. Jeroboam enweghi kwa ike ọzọ n'ubọchi Abaija: Jehova we tib͕ue ya, o we nwua.

21. Abaija we me onwe-ya ka ọ di ike, o we lutara onwe-ya ndinyom iri na anọ, mua orú umu-ndikom na abua, na umu-ndinyom iri na isi.

22. Ma ihe nile Abaija mere nke fọduru, na uzọ-ya nile, na okwu-ya nile, edewo ha n'akukọ Ido, bú onye-amuma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 13