Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 13:16-22 Bible Nso (IGBOB)

16. Umu Israel we si n'iru Juda b͕alaga: Chineke we nye ha n'aka-ha.

17. Abaija na ndi-ya we tib͕ue ha ọtutu ntib͕u: orú nnù ndi eb͕uru eb͕u ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, we dapu n'Israel.

18. Ewe weda umu Israel n'ala na mb͕e ahu, umu Juda we b͕a ume, n'ihi na ha dabere na Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.

19. Abaija we chuso Jeroboam, nara ya obodo, bú Bet-el na umu-obodo-ya, na Jeshana na umu-obodo-ya, na Efron na umu-obodo-ya.

20. Jeroboam enweghi kwa ike ọzọ n'ubọchi Abaija: Jehova we tib͕ue ya, o we nwua.

21. Abaija we me onwe-ya ka ọ di ike, o we lutara onwe-ya ndinyom iri na anọ, mua orú umu-ndikom na abua, na umu-ndinyom iri na isi.

22. Ma ihe nile Abaija mere nke fọduru, na uzọ-ya nile, na okwu-ya nile, edewo ha n'akukọ Ido, bú onye-amuma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 13