Ma mb͕e Jehova huru na ha wedara onwe-ha n'ala, okwu Jehova ruru Shemaia nti, si, Ha ewedawo onwe-ha n'ala; M'gaghi-ebibi ha: kama M'gēnye ha nb͕apu na mb͕e ntà, agaghi-awusi kwa ọnumam na Jerusalem site n'aka Shaishak.