Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 11:12-23 Bible Nso (IGBOB)

12. O tiye-kwa-ra ọta na ube n'obodo nile ọ bula, we me ka ha di ike ri nne. O we nwe Juda na Benjamin.

13. Ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi nọ n'Israel nile we si n'ókè-ala-ha nile guzo onwe-ha n'akuku ya.

14. N'ihi na ndi Livai rapuru ebe-ita-nri-anu nile ha na ihe-onwunwe-ha, we jerue Juda, jeru kwa Jerusalem: n'ihi na Jeroboam na umu-ya ndikom juru ha, ka ha ghara iburu Jehova ndi-nchu-àjà:

15. ọ we guzoro onwe-ya ndi-nchu-àjà idiri ebe di elu, na idiri nkpi, na idiri umu-ehi, nke o mere.

16. Site n'ebo nile nke Israel ndi nēnye obi-ha ichọ Jehova, bú Chineke Israel, so-kwa-ra ha bia na Jerusalem ichuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, àjà.

17. Ha we me ka ala-eze Juda di ike, ha b͕a kwa Rehoboam nwa Solomon ume, arọ atọ: n'ihi na ha jere ije n'uzọ Devid na Solomon arọ atọ.

18. Rehoboam we lutara onwe-ya nwunye, bú Mahalat nwa-nwayi Jerimot nwa Devid, na Abihail nwa-nwayi Elaiab nwa Jesi,

19. o we muara ya umu-ndikom; Jeush, na Shemaria, na Zaham.

20. Mb͕e ọ lusiri ya ọ luta-kwa-ra Meaka nwa-nwayi Absalom; o we muara ya Abaija, na Atai, na Ziza, na Shelomit.

21. Rehoboam we hu Meaka nwa Absalom n'anya kari ndinyom-ya nile na iko-ya ndinyom nile: (n'ihi na ndinyom iri na asatọ ka ọ lutara, nwe kwa ọgu iko-ndinyom atọ, o we mua orú umu-ndikom na asatọ na ọgu umu-ndinyom atọ).

22. Rehoboam we guzo Abaija nwa Meaka ibu onye-isi, ọbuná ibu onye-ndú n'etiti umu-nne-ya: n'ihi na ọ di n'obi-ya ime ya eze.

23. O nwe-kwa-ra nghọta, we me ka ufọdu nime umu-ya ndikom nile b͕asa rue ala nile nke Juda na Benjamin, rue obodo ọ bula ewusiri ike: o we nye ha nri n'uba. O we chọ ìgwè ndinyom.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 11