Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 10:11-16 Bible Nso (IGBOB)

11. Ma ub͕u a nnam boro unu yoke di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.

12. Jeroboam na ndi Israel nile we biakute Rehoboam n'ubọchi nke-atọ, dika eze kwuru, si, Laghachikutenum n'ubọchi nke-atọ.

13. Eze we za ha okwu ike; eze, bú Rehoboam, we rapu idu-ọdu nke ndi-okenye,

14. gwa ha okwu dika idu-ọdu nke umu-okorọbia si di, si, Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na ya: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.

15. Eze we ghara ige ndi Israel nti; n'ihi na nchighari nka sitere n'aka Chineke, ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Ọ gwara Jeroboam nwa Nebat site n'aka Ahaija onye Shailo.

16. Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jesi: lanu, nwoke ọ bula, n'ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel nile we la n'ulo-ikwū-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 10