Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 10:10-14 Bible Nso (IGBOB)

10. Umu-okorọbia ndi ya na ha tokọzuru okè we gwa ya okwu, si, Otú a ka i gāsi ndi nka, ndi gwara gi okwu, si, Nna-gi mere yoke-ayi ka ọ di arọ́, ma gi onwe-gi me ka ọ di ayi nfe kari; otú a ka i gāsi ha, Nkpisi-aka nke-ntà nkem di okpotokpo kari úkwù nnam.

11. Ma ub͕u a nnam boro unu yoke di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.

12. Jeroboam na ndi Israel nile we biakute Rehoboam n'ubọchi nke-atọ, dika eze kwuru, si, Laghachikutenum n'ubọchi nke-atọ.

13. Eze we za ha okwu ike; eze, bú Rehoboam, we rapu idu-ọdu nke ndi-okenye,

14. gwa ha okwu dika idu-ọdu nke umu-okorọbia si di, si, Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na ya: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 10