Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ihe Emere 10:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Rehoboam we jerue Shekem: n'ihi na Shekem ka Israel nile biaruru ime ya eze.

2. O rue, mb͕e Jeroboam nwa Nebat nuru ya, (ma onye ahu nọ n'Ijipt, ebe o siri n'iru Solomon, bú eze, b͕alaga,) na Jeroboam siri n'Ijipt lata.

3. Ha we ziga, kpọ ya; Jeroboam na Israel nile we bia, gwa Rehoboam okwu, si,

4. Nna-gi mere yoke-ayi ka o sie ike: ma ub͕u a me ka ọ di nfe kari, bú òfùfè siri ike nke nna-gi, na yoke-ya di arọ́ nke ọ tukwasiri ayi, ayi gēfè kwa gi òfùfè.

5. Ọ si ha, Mb͕e ubọchi atọ gasiri unu laghachikutekwam. Ndi Israel we la.

6. Eze, bú Rehoboam, we me ka ndi-okenye dua ya ọdu, bú ndi nēguzo n'iru Solomon nna-ya mb͕e ọ nọ na ndu, si, Ùnu onwe-unu si aṅa nādu ọdu iweghachiri ndi nka okwu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 2. Ihe Emere 10