Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 9:9-21 Bible Nso (IGBOB)

9. (Na mb͕e gara aga n'Israel, otú a ka otu nwoke siri mb͕e o jere iju Chineke ase, Bianu, ka ayi jekuru onye-ọhu-uzọ: n'ihi na onye anākpọ Onye-amuma ta, anākpọ ya Onye-ọhu-uzọ na mb͕e gara aga).

10. Sọl we si nwa-okorọbia-ya, Okwu-gi di nma; bia, ka ayi je. Ha we je n'obodo ebe onye nke Chineke nọ.

11. Ka ndi ahu nārigo na nrigo obodo ahu, ha onwe-ha hutara umu-ab͕ọghọ ka ha nāputa isere miri, ha we si ha, Onye-ọhu-uzọ, ọ̀ nọ n'ebe a?

12. Ha we za ha, si, Ọ nọ, le, ọ nọ n'iru gi: me ngwa ub͕u a, n'ihi na ta ka ọ batara n'obodo; n'ihi na ndi Israel nwere àjà ta n'ebe di elu a:

13. mb͕e unu bara n'obodo, otú a ka unu gāchọta ya, tutu ọ rigorue ebe di elu iri ihe: n'ihi na ndi Israel agaghi-eri ihe rue mb͕e ọ biara, n'ihi na ya onwe-ya nāgọzi àjà-ha; emesia ndi akpọworo gēri ihe. Ma ub͕u a rigonu; n'ihi na ya onwe-ya, ub͕u a ka unu gāchọta ya.

14. Ha we rigorue obodo; ka ndi ahu nābà n'etiti obodo, le, Samuel nāputa izute ha, irigoru ebe di elu ahu.

15. Ma Jehova kpughepuru nti Samuel ka ọ nu ihe otù ubọchi tutu Sọl abia, si,

16. Dika mb͕e a echi M'gēzitere gi otù nwoke sitere n'ala Benjamin, i gēte kwa ya manu ibu onye-ndú ndim, bú Israel, ọ gāzọputa kwa ndim n'aka ndi Filistia: n'ihi na ahuwom ndim, n'ihi na iti-nkpu-ha abàwom na nti.

17. Mb͕e Samuel huru Sọl, Jehova we za ya, si, Le nwoke ahu onye M'siri gi te manu! onye a gēb͕ochi ndim n'ime ihe ọjọ.

18. Sọl we biarue Samuel nso n'etiti ọnu-uzọ-ama, si, Biko, gosim ebe ọ di, bú ulo onye-ọhu-uzọ.

19. Samuel we za Sọl, si, Mu onwem bu onye-ọhu-uzọ ahu; rigorue ebe di elu n'irum, unu gēsokwam ri ihe ta: m'gēzilaga kwa gi n'ututu, ihe nile nke di n'obi-gi ka m'gēgosi kwa gi.

20. Ma nne-inyinya-ibu-gi nke funariri gi, ta bu ubọchi atọ, atukwasila obi-gi na ha; n'ihi na achọtawo ha. Ma ònye nwere ihe nile anāchọsi ike nke Israel? ọ bughi gi na ulo nile nke nna-gi?

21. Sọl we za, si, Ọ̀ bughi onye Benjamin ka m'bu, sitere n'ebo Israel nke dikarisiri ntà? ab͕urum, ọ̀ pekarisighi npe n'etiti ab͕uru nile nke ebo Benjamin? n'ìhi gini kwa ka i gwaworom okwu dika okwu a si di?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 9