Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 9:17-27 Bible Nso (IGBOB)

17. Mb͕e Samuel huru Sọl, Jehova we za ya, si, Le nwoke ahu onye M'siri gi te manu! onye a gēb͕ochi ndim n'ime ihe ọjọ.

18. Sọl we biarue Samuel nso n'etiti ọnu-uzọ-ama, si, Biko, gosim ebe ọ di, bú ulo onye-ọhu-uzọ.

19. Samuel we za Sọl, si, Mu onwem bu onye-ọhu-uzọ ahu; rigorue ebe di elu n'irum, unu gēsokwam ri ihe ta: m'gēzilaga kwa gi n'ututu, ihe nile nke di n'obi-gi ka m'gēgosi kwa gi.

20. Ma nne-inyinya-ibu-gi nke funariri gi, ta bu ubọchi atọ, atukwasila obi-gi na ha; n'ihi na achọtawo ha. Ma ònye nwere ihe nile anāchọsi ike nke Israel? ọ bughi gi na ulo nile nke nna-gi?

21. Sọl we za, si, Ọ̀ bughi onye Benjamin ka m'bu, sitere n'ebo Israel nke dikarisiri ntà? ab͕urum, ọ̀ pekarisighi npe n'etiti ab͕uru nile nke ebo Benjamin? n'ìhi gini kwa ka i gwaworom okwu dika okwu a si di?

22. Samuel we kuru Sọl na nwa-okorọbia-ya, me ka ha ba n'ime-ulo, o we nye ha isi ọnọdu n'etití ndi akpọrọ n'oriri ahu, ndi ahu ra ka orú madu na iri.

23. Samuel we si odozi-anu, Weta òkè nke m'nyere gi, nke m'siri gi, Dọba ya n'ebe i nọ.

24. Odozi-anu ahu we bulie utaku-ukwu ahu na ihe di n'elu ya, dọba ya n'iru Sọl. Samuel we si, Le ihe fọduru! dọba ya n'iru gi, rie; n'ihi na rue mb͕e akara àkà ka edebeworo gi nka, si, Akpọwom ndi Israel. Sọl we soro Samuel rie ihe ubọchi ahu.

25. Ha we si n'ebe di elu ahu rida n'obodo, o we kpayere Sọl uka n'elu-ulo.

26. Ha we bilie n'isi-ututu: o we rue, mb͕e chi bọrọ, na Samuel kpọrọ Sọl n'elu-ulo, si, Bilie, ka m'we zilaga gi. Sọl we bilie, ha abua we pua, ya onwe-ya na Samuel, rue èzí.

27. Ka ha onwe-ha nārida na nsọtu obodo, Samuel we si Sọl, Si nwa-okorọbia-gi gabiga n'iru ayi, (ọ we gabiga,) ma gi onwe-gi guzogide ub͕u a, ka m'we me ka i nu okwu Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 9