Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 9:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma otù nwoke Benjamin di, aha-ya bu Kish, nwa Abiel, nwa Zeroa, nwa Bekorat, nwa Afia, nwa onye Benjamin, bú dike nke bu dìnkpà.

2. Ọ nwe-kwa-ra nwa-nwoke, aha-ya bu Sọl, ọ bu nwa-okorọbia, ọ ma-kwa-ra nma: ọ dighi kwa nwoke n'etiti umu Israel mara nma kari ya: site n'ubu-ya we rue elu isi-ya ka ọ di ogologo kari onye ọ bula nime ndi Israel.

3. Ma nne-inyinya-ibu nile nke Kish, bú nna Sọl, nwere furu efu. Kish we si Sọl nwa-ya, Biko, kuru otù nime ndi-orù tiyere onwe-gi, bilie, je, chọ nne-inyinya-ibum.

4. O we gabiga n'ugwu Efraim, gabiga kwa n'ala Shalisha, ma ha achọtaghi ha: ha we gabiga n'ala Shaalim, ma ha adighi n'ebe ahu: o we gabiga n'ala Benjamin, ma ha achọtaghi ha.

5. Mb͕e ndi ahu batara n'ala Zuf, Sọl siri nwa-okorọbia-ya nke soro ya je, Bia, ka ayi laghachi; ka nnam we ghara igha iche uche bayere nne-inyinya-ibu-ya, we cheb͕u onwe-ya bayere ayi.

6. O we si ya, Biko, le, onye nke Chineke nọ n'obodo a, anāsọpuru kwa nwoke ahu; ihe nile ọ nēkwu aghaghi irè erè: ub͕u a ka ayi je n'ebe ahu; eleghi anya ọ gēgosi ayi uzọ-ayi nke ayi jeworo na ya.

7. Sọl we si nwa-okorọbia-ya, Ma, le, ọ buru na ayi eje, gini ka ayi gēji bakuru nwoke ahu? n'ihi na achicha alapuwo n'ihe-ayi, ọ dighi kwa onyinye iji bakuru onye nke Chineke: gini di n'aka-ayi?

8. Nwa-okorọbia ahu we za Sọl ọzọ, si, Le, achọtawo n'akam otù uzọ n'uzọ anọ nke shekel ọla-ọcha: m'gēnye kwa ya onye nke Chineke, ka o we gosi ayi uzọ-ayi.

9. (Na mb͕e gara aga n'Israel, otú a ka otu nwoke siri mb͕e o jere iju Chineke ase, Bianu, ka ayi jekuru onye-ọhu-uzọ: n'ihi na onye anākpọ Onye-amuma ta, anākpọ ya Onye-ọhu-uzọ na mb͕e gara aga).

10. Sọl we si nwa-okorọbia-ya, Okwu-gi di nma; bia, ka ayi je. Ha we je n'obodo ebe onye nke Chineke nọ.

11. Ka ndi ahu nārigo na nrigo obodo ahu, ha onwe-ha hutara umu-ab͕ọghọ ka ha nāputa isere miri, ha we si ha, Onye-ọhu-uzọ, ọ̀ nọ n'ebe a?

12. Ha we za ha, si, Ọ nọ, le, ọ nọ n'iru gi: me ngwa ub͕u a, n'ihi na ta ka ọ batara n'obodo; n'ihi na ndi Israel nwere àjà ta n'ebe di elu a:

13. mb͕e unu bara n'obodo, otú a ka unu gāchọta ya, tutu ọ rigorue ebe di elu iri ihe: n'ihi na ndi Israel agaghi-eri ihe rue mb͕e ọ biara, n'ihi na ya onwe-ya nāgọzi àjà-ha; emesia ndi akpọworo gēri ihe. Ma ub͕u a rigonu; n'ihi na ya onwe-ya, ub͕u a ka unu gāchọta ya.

14. Ha we rigorue obodo; ka ndi ahu nābà n'etiti obodo, le, Samuel nāputa izute ha, irigoru ebe di elu ahu.

15. Ma Jehova kpughepuru nti Samuel ka ọ nu ihe otù ubọchi tutu Sọl abia, si,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 9