13. Ọ bu kwa umu-unu ndinyom ka ọ gāchiri ibu ndi nāsugwa ude nēsì ísì utọ, na ibu ndi-odozi-anu, na ibu ndi-osi-ite.
14. Ubi-unu, na ubi-vine-unu, na ubi-olive-unu, bú nke kachasi nma, ka ọ gēwere kwa, nye ndi-orù-ya.
15. Nkpuru-ọghigha-unu na ubi-vine-unu ka ọ gēwere otù uzọ n'uzọ iri, nye ndi nējere ya ozi, nye kwa ndi-orù-ya.
16. Ọ bu kwa ndi-orù-unu ndikom, na ndinyom nējere unu ozi, na umu-okorọbia-unu, bú ndi kachasi nma, na inyinya-ibu-unu, ka ọ gēwere, me ka ha je ozi-ya.
17. Ìgwè ewu na aturu-unu ka ọ gēwere kwa otù uzọ n'uzọ iri: unu onwe-unu gābu-kwa-ra ya orù.
18. Unu gēti kwa nkpu n'ubọchi ahu n'ihi eze-unu nke unu rọputara onwe-unu; ma Jehova agaghi-aza unu n'ubọchi ahu.
19. Ma ndi Israel juru ige nti olu Samuel; ha si, É-è; kama, eze gāchiri ayi;
20. ka ayi we di, ọbuná ayi onwe-ayi, ka mba nile; ka eze-ayi we nēkpe kwa ayi ikpe, nāpu kwa je n'iru ayi, nēbu kwa agha-ayi.
21. Samuel we nu okwu nile nke ndi Israel, o we kwue ha na nti Jehova.
22. Jehova we si Samuel, Ge nti olu-ha, mere ha eze. Samuel we si ndikom Israel, Lanu, nwoke ọ bula n'obodo-ya.