Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 7:9-17 Bible Nso (IGBOB)

9. Samuel we were otù nwa-aturu nke nāṅu ara, o we sure ya ọku ka ọ buru àjà-nsuresi-ọku anēsurere Jehova: Samuel we tikue Jehova nkpu bayere Israel; Jehova we za ya.

10. O rue, mb͕e Samuel nēsure àjà-nsure-ọku ahu, na ndi Filistia biaruru nso ibuso Israel agha: Jehova we were oké olu makwasi ndi Filistia éb͕è-elu-igwe n'ubọchi ahu, we me ka ha b͕a aghara; ewe tib͕ue ha n'iru Israel.

11. Ndikom Israel we si na Mizpa puta, chua ndi Filistia, tib͕ue ha rue okpuru Bet-ka.

12. Samuel we were otù nkume do ya n'etiti Mizpa na Shen, kpọ aha-ya Eben-eza, si, Jehova eyerewo ayi aka rue ub͕u a.

13. Ewe me ka ndi Filistia ruru ala, ha abàghi ọzọ n'ókè-ala Israel: aka Jehova we digide ndi Filistia ubọchi nile nke Samuel.

14. Ewe nyeghachi Israel obodo nile nke ndi Filistia nara Israel, site n'Ekron we rue Gat; ókè-ala-ha ka Israel naputara n'aka ndi Filistia. Ma udo di n'etiti Israel na ndi-Amorait.

15. Samuel we kpe Israel ikpe ubọchi nile nke ndu-ya.

16. O we nēje buruburu kwa-arọ rue Bet-el, na Gilgal, na Mizpa; o we kpe Israel ikpe n'ebe ahu nile.

17. Nlata-ya bu na Rema, n'ihi na n'ebe ahu ka ulo-ya di; ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ kpere Israel ikpe: o we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 7