Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 7:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndikom Kiriat-jearim we bia, bugo ib͕e Jehova, bubata ya n'ulo Abinadab n'ugwu ntà ya, do Eleeza nwa-ya nwoke nsọ idebe ib͕e Jehova.

2. O rue, site n'ubọchi ib͕e ahu nọduru na Kiriat-jearim, na ubọchi bara uba; o we di orú arọ: ulo Israel nile we kwaso Jehova.

3. Samuel we gwa ulo Israel nile okwu, si, Ọ buru na obi-unu nile ka unu onwe-unu nēwere laghachikute Jehova, wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ na Ashtarot n'etiti unu, dozie obi-unu ibiakute Jehova, fè-kwa-nu nání Ya òfùfè: Ọ gānaputa kwa unu n'aka ndi Filistia.

4. Umu Israel we wezuga Bealim na Ashtarot, fè nání Jehova òfùfè.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 7