Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 6:15-21 Bible Nso (IGBOB)

15. Ndi Livai we buda ib͕e Jehova na ib͕e ntà nke di n'akuku ya, nke ihe ọla-edo ahu nile di nime ya, ha we tukwasi ha na nkume uku ahu: ndikom Bet-shemesh we sure àjà-nsure-ọku, chu-kwa-ra Jehova aja ọzọ, n'ubọchi ahu.

16. Ndi-isi ise nke ndi Filistia we hu ya, laghachi rue Ekron n'ubọchi ahu.

17. Ndia bu emerod ọla-edo nke ndi Filistia nyeghachiri, ibu àjà-ikpe-ọmuma ichuru Jehova; Ashdod nwere otù, Geza nwere otù, Ashkelon nwere otù, Gat nwere otù, Ekron nwere otù;

18. òké ọla-edo kwa, dika ọnu-ọgugu obodo nile nke ndi Filistia si di, bú nke ndi-isi ise ahu nwere, site n'obodo ewusiri ike we rue obodo ntà nke nēnweghi mb͕idi: we rue nkume uku ahu, bú Ebel, nke ha dọbara ib͕e Jehova n'elu ya: ọ di n'ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, rue ta.

19. O we tib͕ue ufọdu nime ndikom Bet-shemesh, n'ihi na ha lere anya nime ib͕e Jehova, O we tib͕ue n'etiti ndi Israel ọgu ndikom atọ na iri, orú nnù ndikom uzọ isi na nnù ise: ndi Israel we rue újú, n'ihi na Jehova tib͕uru ntib͕u uku n'etiti ndi Israel.

20. Ndikom Bet-shemesh we si, Ònye puru iguzo n'iru Jehova, bú Chineke nsọ a? Ọ̀ bu kwa onye ka O gēsi n'ebe ayi nọ rigokuru?

21. Ha we zigara ndi bi na Kiriat-jearim ndi-ozi, si, Ndi Filistia ebughachiwo ib͕e Jehova; ridatanu, bugo ya n'ebe unu nọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 6