Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 5:2-7 Bible Nso (IGBOB)

2. Ndi Filistia we were ib͕e Chineke, bubata ya n'ulo Degon, dọba ya n'akuku Degon.

3. Ndi Ashdod we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova. Ha we were Degon, tiyeghachi ya n'ọnọdu-ya.

4. Ha we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova; ma ebipuwo isi Degon na ọbu-aka-ya abua, ha we tọb͕ọrọ na nbata-uzọ; nání akuku-ya nke bu azù fọduru ya.

5. N'ihi ya ndi-nchu-aja Degon na ndi nile nke nābà n'ulo Degon adighi-azọkwasi ukwu na nbata-uzọ Degon n'Ashdod, rue ta.

6. Aka Jehova we di arọ́ n'aru ndi Ashdod, Ọ we kpochapu ha, were kwa emerod tib͕ue ha, bú Ashdod na ókè-ala-ya nile.

7. Ndikom Ashdod we hu na ọ di otú a, ha we si, Ib͕e Chineke Israel agaghi-anọgide n'etiti ayi: n'ihi na aka-Ya esikawo ike n'aru ayi na n'aru Degon, bú chi-ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 5