Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 29:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha nile rue Efek: Israel nāma kwa ulo-ikwū-ha n'akuku isi-iyi nke di na Jezreel.

2. Ndi-isi ndi Filistia we nāgabiga ọgu ise, ọgu ise, na nnù abua na ọgu iri, nnù abua na ọgu iri: Devid na ndikom-ya nāgabiga kwa n'azu, ha na Ekish.

3. Ndi-isi Filistia we si, Ndi-Hibru ndia, hà bu gini? Ekish we si ndi-isi ndi Filistia, Nkà abughi Devid, bú orù Sọl eze Israel, onye mu na ya nọworo ubọchi ndia ma-ọbu arọ ndia, ma ahutaghm n'aru ya ihe ọ bula di njọ site n'ubọchi ọ dapuru n'aka Sọl rue ta?

4. Ma ndi-isi ndi Filistia were iwe megide ya; ndi-isi ndi Filistia we si ya, Me ka nwoke a laghachi, ka o we laghachi n'ọnọdu-ya ebe i mere ka ọ buru onye-nlekọta-ya, ma ka ọ ghara iso ayi rida n'agha, ka o we ghara ighọrọ ayi onye-nmegide n'agha ahu: n'ihi na onye a gēji gini me ka ihe-ya tọ onye-nwe-ya utọ? ọ̀ gaghi-eji isi ndikom ndia?

5. Nkà abughi Devid, onye ha zaritara onwe-ha ihe bayere ya n'ite-egwú si,Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri,Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise?

6. Ekish we kpọ Devid, si ya, Jehova nādi ndu, n'ezie onye ziri ezi ka i bu: ọpupu-gi na nbata-gi n'ọmuma-ulo-ikwū n'akam di kwa nma n'anyam: n'ihi na ahutaghm ihe ọjọ n'aru gi site n'ubọchi i biakuterem rue ta: ma n'anya ndi-isi onye nādighi nma ka i bu.

7. Ma ub͕u a, laghachi, je kwa n'udo, ka i we ghara ime ihe ọjọ n'anya ndi-isi ndi Filistia.

8. Devid we si Ekish, Ma gini ka m'meworo? gini kwa ka i hutaworo n'aru orù-gi site n'ubọchi m'nọworo n'iru gi rue ta, na m'gaghi-abà buso ndi-iro onye-nwem, bú eze, agha?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 29