Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 27:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Devid we si obi-ya. Ub͕u a agēkpochapum otù ubọchi site n'aka Sọl: ọ dighi ihe dirim nma kari iwepugasi onwem ba n'ala ndi Filistia; Sọl agaghi-atukwasi kwa obi-ya n'arum, ichọm ọzọ n'ókè-ala nile nke Israel: m'gēwepuga kwa onwem n'aka-ya.

2. Devid we bilie, gabiga, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi nọ n'aka-ya, biakute Ekish nwa Maok, bú eze Gat.

3. Devid we biri n'aka Ekish na Gat, ya onwe-ya na ndikom-ya, nwoke ọ bula na ulo-ya, bú Devid na ndinyom-ya abua, Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail nwayi Kamel, bú nwunye Nebal.

4. Ewe gosi Sọl na Devid ab͕alagawo rue Gat: o we ghara ichọ ya ọzọ ma-ọli.

5. Devid we si Ekish, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru-gi, ka ha nyem ebe n'otù obodo nime obodo ọhia, ka m'we biri n'ebe ahu: ma n'ìhi gini ka orù-gi gēbi n'obodo eze n'aka-gi?

6. Ekish we nye ya Ziklag n'ubọchi ahu: n'ihi ya ndi-eze Juda nwe Ziklag rue ta.

7. Ọnu-ọgugu ubọchi Devid biri n'ọhia ndi Filistia bu otù arọ zuru ezu na ọnwa anọ.

8. Devid na ndikom-ya we rigo, made imegide ndi Geshua, na ndi-Giazait, na ndi Amalek: n'ihi na ndi ahu bu ndi bi n'ala ahu, ndi sitere na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ebe i nābà na Shua, we rue n'ala Ijipt.

9. Devid we tib͕ue ala ahu, o meghi kwa ka nwoke ma-ọbu nwayi di ndu, ma ọ chiri ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na inyinya-ibu, na camel, na uwe, laghachi, biakute Ekish.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 27