Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 27:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Devid we si obi-ya. Ub͕u a agēkpochapum otù ubọchi site n'aka Sọl: ọ dighi ihe dirim nma kari iwepugasi onwem ba n'ala ndi Filistia; Sọl agaghi-atukwasi kwa obi-ya n'arum, ichọm ọzọ n'ókè-ala nile nke Israel: m'gēwepuga kwa onwem n'aka-ya.

2. Devid we bilie, gabiga, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi nọ n'aka-ya, biakute Ekish nwa Maok, bú eze Gat.

3. Devid we biri n'aka Ekish na Gat, ya onwe-ya na ndikom-ya, nwoke ọ bula na ulo-ya, bú Devid na ndinyom-ya abua, Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail nwayi Kamel, bú nwunye Nebal.

4. Ewe gosi Sọl na Devid ab͕alagawo rue Gat: o we ghara ichọ ya ọzọ ma-ọli.

5. Devid we si Ekish, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru-gi, ka ha nyem ebe n'otù obodo nime obodo ọhia, ka m'we biri n'ebe ahu: ma n'ìhi gini ka orù-gi gēbi n'obodo eze n'aka-gi?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 27