Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 24:9-22 Bible Nso (IGBOB)

9. Devid we si Sọl, N'ìhi gini ka i nēge nti okwu madu, si, Le, Devid nāchọ imejọ gi?

10. Le, ubọchi ta ka anya-gi abua huworo otú Jehova nyere gi n'akam ta n'ọb͕à: ewe si ka m'b͕ue gi: ma anyam mere gi ebere; m'we si, M'gaghi-eseti akam megide onye-nwem, n'ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu.

11. Ma, nnam, le, e, le ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi n'akam: n'ihi na nime nbipu m'bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi, ma eb͕ughm i, gi mara hu kwa na ọ dighi ihe ọjọ ma-ọbu njehie di n'akam, emehieghkwam megide gi; ma gi onwe-gi nāchu ntá nkpuru-obim iwere ya.

12. Jehova kpe ikpe n'etiti mu na gi, Jehova bọ-kwa-ram ọ́bọ̀ n'aru gi: ma akam agaghi-adi n'aru gi.

13. Dika ilu ndi mb͕e mbu nāsi, Na ndi nēmebi iwu ka nmebi-iwu si aputa: ma akam agaghi-adi n'aru gi.

14. Ònye ka eze Israel putaworo iso n'azu? ònye ka i nāchu n'azu? ọ bu n'azu nkita nwuru anwu, n'azu otù igwu.

15. Ma Jehova buru onye-ikpe, kpe ikpe n'etiti mu na gi, Ya hu kwa, kpe ọnum n'ikpe, kpeputam n'aka-gi.

16. O rue, mb͕e Devid gwabìri Sọl okwu ndia, na Sọl siri, Ọ̀ bu olu-gi, bú nka, nwam Devid? Sọl we welie olu-ya, kwa ákwá.

17. Ọ si Devid, Onye ezi omume ka i bu karim: n'ihi na gi onwe-gi emewom ezi ihe, ma mu onwem emewo gi ihe ọjọ.

18. Gi onwe-gi egosiwo ta na i mewo ezi ihe n'ebe m'nọ: n'ihi na mb͕e Jehova mechibidorom nye n'aka-gi, i b͕ughm.

19. Ma mb͕e madu gāchọta onye-iro-ya, ò gēzilaga kwa ya n'ezi uzọ? Jehova kwughachi kwa gi ezi ihe n'ọnọdu ihe a i meworom ta.

20. Ma ub͕u a, le, amawom na i ghaghi ibu eze, na agēme kwa ka ala-eze Israel guzosie ike n'aka-gi.

21. Ma ub͕u a were Jehova ṅuaram iyi, na i gaghi-ebipu nkpurum gānọchim n'azu, na i gaghi-ekpochapu aham n'ulo nnam.

22. Devid we ṅuara Sọl iyi. Sọl we laghachi; ma Devid na ndikom-ya rigoro n'ebe ahu ewusiri ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 24