Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 24:16-22 Bible Nso (IGBOB)

16. O rue, mb͕e Devid gwabìri Sọl okwu ndia, na Sọl siri, Ọ̀ bu olu-gi, bú nka, nwam Devid? Sọl we welie olu-ya, kwa ákwá.

17. Ọ si Devid, Onye ezi omume ka i bu karim: n'ihi na gi onwe-gi emewom ezi ihe, ma mu onwem emewo gi ihe ọjọ.

18. Gi onwe-gi egosiwo ta na i mewo ezi ihe n'ebe m'nọ: n'ihi na mb͕e Jehova mechibidorom nye n'aka-gi, i b͕ughm.

19. Ma mb͕e madu gāchọta onye-iro-ya, ò gēzilaga kwa ya n'ezi uzọ? Jehova kwughachi kwa gi ezi ihe n'ọnọdu ihe a i meworom ta.

20. Ma ub͕u a, le, amawom na i ghaghi ibu eze, na agēme kwa ka ala-eze Israel guzosie ike n'aka-gi.

21. Ma ub͕u a were Jehova ṅuaram iyi, na i gaghi-ebipu nkpurum gānọchim n'azu, na i gaghi-ekpochapu aham n'ulo nnam.

22. Devid we ṅuara Sọl iyi. Sọl we laghachi; ma Devid na ndikom-ya rigoro n'ebe ahu ewusiri ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 24