Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 23:14-24 Bible Nso (IGBOB)

14. Devid we nọdu n'ọzara n'ebe ewusiri ike, o we nọdu n'ugwu n'ọzara Zif. Sọl we nāchọ ya ubọchi nile, ma Chineke enyeghi ya n'aka-ya.

15. Devid we hu na Sọl aputawo ichọ ndu-ya: ma Devid nọ n'ọzara Zif n'oké ọhia.

16. Jonatan nwa Sọl we bilie, jekuru Devid n'oké ọhia ahu, me ka aka-ya di ike nime Chineke.

17. Ọ si ya, Atula egwu: n'ihi na aka nnam, bú Sọl, agaghi-achọta gi; gi onwe-gi gābu kwa eze Israel, mu onwem gābu-kwa-ra gi onye nke-abua; ọzọ kwa, Sọl, bú nnam, mara nka.

18. Ha abua we b͕a ndu n'iru Jehova: Devid we nọdu n'oké ọhia, ma Jonatan lara n'ulo-ya.

19. Ndi Zif we rigokuru Sọl rue Gibea, si, Devid, ò zoghi onwe-ya n'etiti ayi n'ebe ewusiri ike n'oké ọhia, n'ugwu ntà Hakila, nke di na Ndida nke ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu?

20. Ma ub͕u a, eze, dika agu nile nke nāgu nkpuru-obi-gi iridata si di, ridata; ọ diri ayi imechibido ya nye n'aka eze.

21. Sọl we si, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu; n'ihi na unu enwewo ọmiko n'arum.

22. Biko, lanu, dozi-kwa-nu ọzọ, mára hu kwa ọnọdu-ya ebe ukwu-ya di, na onye huworo ya n'ebe ahu: n'ihi na agwawom na ya onwe-ya nāghọ aghughọ nke-uku.

23. Ma hunu, we mara ebe-izo-nzuzo nile ebe o nēzo onwe-ya, unu biaghachikutekwam mb͕e unu dozisiri onwe-unu, m'gēso kwa unu je: o gēru kwa, ọ buru na ọ nọ n'ala nka, na m'gāchọputa ya n'usu nnù ndikom Juda abua na ọgu iri nile.

24. Ha we bilie, jerue Zif n'iru Sọl: ma Devid na ndikom-ya di n'ọzara Maon, n'Araba, na Ndida nke ala ahu tọb͕ọrọ n'efu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 23