Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 23:11-16 Bible Nso (IGBOB)

11. Ndi-nwe Keila, ha gēmechibidom nye n'aka-ya? Sọl, ọ̀ gāridata, dika orù-Gi nuworo? Jehova, bú Chineke Israel, biko, gosi orù-Gi. Jehova we si, Ọ gāridata.

12. Devid we si, Ndi-nwe Keila, hà gēmechibidom na ndikom nkem nye n'aka Sọl? Jehova we si, Ha gēmechibido gi nye.

13. Devid na ndikom-ya, ihe ra ka nnù ndikom na ọgu iri, we bilie, si na Keila pua, ha we nējeghari ebe ha huru uzọ ijeghari. Ewe gosi Sọl na Devid esiwo na Keila wepuga onwe-ya; o we ghara iputa.

14. Devid we nọdu n'ọzara n'ebe ewusiri ike, o we nọdu n'ugwu n'ọzara Zif. Sọl we nāchọ ya ubọchi nile, ma Chineke enyeghi ya n'aka-ya.

15. Devid we hu na Sọl aputawo ichọ ndu-ya: ma Devid nọ n'ọzara Zif n'oké ọhia.

16. Jonatan nwa Sọl we bilie, jekuru Devid n'oké ọhia ahu, me ka aka-ya di ike nime Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 23