Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 22:3-16 Bible Nso (IGBOB)

3. Devid we si n'ebe ahu je rue Mizpe Moab: ọ si eze Moab, Biko, ka nnam na nnem puta, nọ n'etiti unu, rue mb͕e m'mara ihe Chineke gēmerem.

4. O we duru ha bia n'iru eze Moab: ha we biri n'aka-ya ubọchi nile Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike.

5. Gad, bú onye-amuma, we si Devid, Anọdula n'ebe a ewusiri ike; je, bara onwe-gi n'ala Juda. Devid we je, ba n'oké ọhia Heret.

6. Sọl we nu na amatara ihe bayere Devid na ndikom ya na ha nọ: ma Sọl nānọdu na Gibea, n'okpuru osisi tamarisk na Rema, ube-ya di kwa n'aka-ya, ndi-orù-ya nile nēguzo n'akuku ya.

7. Sọl we si ndi-orù-ya ndi nēguzo n'akuku ya, Biko, nurunu, unu ndi Benjamin; ọ̀ bu kwa unu nile ka nwa Jesi gēnye ubi na ubi-vine, ọ̀ bu unu nile ka ọ gēdo ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise?

8. na unu nile ekekọtawo onwe-unu imegidem, ọ dighi kwa onye nēkpughepu ntim ka m'nu ya mb͕e nwam na nwa Jesi b͕ara ndu, ọ dighi kwa onye nime unu ọ nēb͕u nb͕u n'obi n'ihim, ma-ọbu nke nēkpughepu ntim ka m'nu na nwam emewo ka orùm bilie imegidem, iche anwu, dika ta.

9. Doeg onye Edom we za, (n'ihi na ya onwe-ya nēguzo n'akuku ndi-orù Sọl), si, Ahurum nwa Jesi ka ọ nābiaru Nob, biakute Ahimelek nwa Ahaitub.

10. O we juara ya ase n'aka Jehova, nye ya ihe ọ gēri n'uzọ, nye kwa ya mma-agha Gọlaiat onye Filistia.

11. Eze we ziga ikpọ Ahimelek nwa Ahaitub, bú onye-nchu-aja, na ulo nna-ya nile, bú ndi-nchu-àjà ndi nọ na Nob: ha we biakute eze, ha nile.

12. Sọl we si, Biko, nuru, gi nwa Ahaitub. O we si, Lem, onye-nwem.

13. Sọl we si ya, N'ìhi gini ka unu kekọtaworo onwe-unu imegidem, gi onwe-gi na nwa Jesi, n'inye ya achicha na mma-agha, na n'ijuru ya ase n'aka Chineke, ka o we bilie imegidem, iche anwu, dika ta?

14. Ahimelek we za eze, si, Ònye kwa n'etiti orù-gi nile di ka Devid? ọ bu onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa di nwa eze, o wezugawo kwa onwe-ya ibà n'etiti ndi nānu okwu-gi, ọ di kwa nsọpuru n'ulo-gi.

15. Ọ̀ bu ta ka m'malitere ijuru ya ase n'aka Chineke? ya burum ihe-árú: ka eze ghara ibo orù-ya ebubo ọ bula, ghara kwa ibo ulo nnam nile: n'ihi na orù-gi amaghi ihe ọ bula n'ihe a nile, nke di ntà ma-ọbu nke di uku.

16. Eze we si, I ghaghi inwu, Ahimelek, gi onwe-gi na ulo nna-gi nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 22