Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 20:36-42 Bible Nso (IGBOB)

36. Ọ si nwa-okoro-ya, B͕a ọsọ, biko chọta àkú nile nke mu onwem nāb͕a. Mb͕e nwa-okoro ahu nāb͕a ọsọ, ya onwe-ya we b͕a àkú, me ka ọ gabiga ya.

37. Nwa-okoro ahu we biarue ebe àkú ahu di, bú nke Jonatan b͕ara, Jonatan we kpọ òkù n'azu nwa-okoro ahu, si, Àkú ahu, ọ̀ dighi n'akuku iru gi?

38. Jonatan we kpọ òkù n'azu nwa-okoro ahu, si, Me ngwa, je ọsọsọ, eguzola. Nwa-okoro Jonatan we chikọta àkú, biakute onye-nwe-ya.

39. Ma nwa-okoro ahu amaghi ihe ọ bula: nání Jonatan na Devid mara okwu ahu.

40. Jonatan we nye nwa-okoro o nwere ihe-ya, si ya, La, chiri ha ba n'obodo.

41. Mb͕e nwa-okoro ahu basiri n'obodo, Devid we si n'akuku Negeb bilie, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala ub͕ò atọ: ha we suturita onwe-ha ọnu, kwaritara onwe-ha ákwá, rue mb͕e Devid kwakariri ákwá.

42. Jonatan we si Devid, La n'udo, n'ihi na ayi aṅuwo iyi, ayi abua, n'aha Jehova, si, Jehova gānọ n'etiti mu na gi, na n'etiti nkpurum na nkpuru-gi, rue mb͕e ebighi-ebi. O we bilie, la: Jonatan we ba n'obodo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 20