Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 20:13-17 Bible Nso (IGBOB)

13. Jehova me Jonatan otú a, me kwa ya ihe ọzọ otú a, mb͕e ọ di nnam nma ime gi ihe ọjọ a, ma m'kpughepughi nti-gi ka i nu ya, we zilaga gi, ka i we la n'udo: Jehova nọye-kwa-ra gi, dika Ọ nọyeworo nnam.

14. Ma ọ bughi nání mb͕e m'nọ na ndu ka i gēmerem ebere nke Jehova, ka m'we ghara inwu:

15. kama i gaghi-ebipu kwa ebere-gi n'ulom rue mb͕e ebighi-ebi: i gaghi-ebipu kwa ya mb͕e Jehova bipuworo ndi-iro Devid, nwoke ọ bula n'elu uwa.

16. Jonatan na ulo Devid we b͕a ndu, si, Jehova gājuta ya n'aka ndi-iro Devid.

17. Jonatan we me kwa ka Devid ṅua iyi ọzọ, n'ihi na ọ huru ya n'anya: n'ihi na dika ọ huru nkpuru-obi nke onwe-ya n'anya, otú a ka ọ huru Devid n'anya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 20