Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 19:8-13 Bible Nso (IGBOB)

8. Agha we di kwa ọzọ: Devid we pua, buso ndi Filistia agha, tib͕ue ha ntib͕u uku; ha we b͕apu n'iru ya.

9. Mọ ọjọ nke Jehova we di n'aru Sọl, ma ya onwe-ya nānọdu n'ulo-ya, ube-ya di kwa n'aka-ya; Devid we were aka-ya nākpọ ubọ.

10. Sọl we chọ iwere ube ahu tugide Devid ọbuná na mb͕idi; ma o repuru n'iru Sọl, ọ we tugide ube ahu na mb͕idi: Devid we b͕alaga, wepuga onwe-ya n'abali ahu.

11. Sọl we ziga ndi-ozi n'ulo Devid, iche ya nche, na ime ka ọ nwua n'ututu: Maikal, bú nwunye-ya, we gosi Devid, si, Ọ buru na i zọputaghi ndu-gi abali a, agēme ka gi onwe-gi nwua echi.

12. Maikal we weda Devid site na window: o we je, b͕alaga, wepuga onwe-ya.

13. Maikal we were terafim-ya, tọb͕ọ ya n'ihe-ndina-ya, tiye ákwà-ob͕ub͕o eji aji ewu me n'okpuru isi-ya, were ákwà-nb͕okwasi kpuchie ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 19