Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 18:15-27 Bible Nso (IGBOB)

15. Sọl we hu na nwoke ahu bu onye nēnwe uche nke-uku, o we tua ujọ ya.

16. Ma Israel nile na Juda nile nāhu Devid n'anya; n'ihi na ya onwe-ya nāpu nābata kwa n'iru ha.

17. Sọl we si Devid, Le, adam, bú Mirab, ya ka m'gēnye gi na nwunye: nání burum dìnkpà, bū kwa agha nile nke Jehova. N'ihi na Sọl siri, Ka akam ghara idi n'aru ya, kama ka aka ndi Filistia di n'aru ya.

18. Devid we si Sọl, Ònye ka m'bu, gini bu kwa ndum, ma-ọbu ab͕uru nnam n'Israel, na m'gāburu eze di nwa-ya?

19. O rue, na mb͕e agēwere Mirab nwa Sọl nye Devid, na nwayi ahu ka enyere Adriel, bú onye Mehola, na nwunye.

20. Ma Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, huru Devid n'anya: ha we gosi Sọl, ihe ahu ziri ezi n'anya-ya.

21. Sọl we si, M'gēnye ya ya, ka o we ghọrọ ya ọnyà, ka aka ndi Filistia we di n'aru ya. Sọl we si Devid, Nke ub͕ò abua ka i gāburum di nwam ta.

22. Sọl we nye ndi-orù-ya iwu, si, Gwanu Devid okwu na nzuzo, si, Le, ihe-gi nātọ eze utọ, ndi-orù-ya nile hu-kwa-ra gi n'anya: ma ub͕u a buru di nwa eze.

23. Ndi-orù Sọl we kwue okwu ndia na nti Devid. Devid we si, Ọ̀ bu ihe di nfe n'anya-unu ibu di nwa eze, ebe mu onwem bu ob͕eye na onye anākpọghi ihe?

24. Ndi-orù Sọl we gosi ya, si, Dika okwu ndia si di ka Devid kwuru.

25. Sọl we si, Otú a ka unu gāsi Devid, Ọ dighi ego-ilu-nwunye gātọ eze utọ, kama ọgu api ise nke ndi Filistia, ka o we bọrọ onwe-ya ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro eze. Ma Sọl chère ime ka Devid da ada n'aka ndi Filistia.

26. Ndi-orù-ya we gosi Devid okwu ndia, ma ihe ahu ziri ezi n'anya Devid, bú ka ọ buru di nwa eze. Ma ubọchi nile akēzughi;

27. Devid we bilie, je, ya onwe-ya na ndikom-ya, o we tib͕ue ọgu ndikom iri n'etiti ndi Filistia; Devid we chita api-ha, ha we nye ha eze n'ọnu-ọgugu zuru ezu, ka o we buru di nwa eze. Sọl we nye ya Maikal nwa-ya na nwunye.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 18