Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 17:28-39 Bible Nso (IGBOB)

28. Elaiab, bú nwa-nne-ya nke-okenye, we nu mb͕e ọ nāgwa ndikom ahu okwu; iwe Elaiab we di ọku megide Devid, ọ si, N'ìhi gini kwa ka i ridataworo? ọ̀ bu kwa n'aka onye ka i rapuru aturu ole-na-ole ahu n'ọzara? mu onwem mara nganga-gi, na ihe ọjọ nke obi-gi; n'ihi na ọ bu ihu agha ka i ridataworo.

29. Devid we si, Gini ka m'meworo ub͕u a? ọ̀ bughi okwu efu, bu ihe a m'nēkwu?

30. O we si n'akuku ya chigharia, che onye ọzọ iru, kwue dika okwu a si di: ndi Israel we zaghachi ya okwu dika okwu mbu si di.

31. Ewe nu okwu nke Devid kwuru, ha we gosi ha n'iru Sọl, o we nara ya.

32. Devid we si Sọl, Ka obi madu ọ bula ghara ifepu n'ihi ya; orù-gi gēje luso onye Filistia nka ọ̀gù.

33. Sọl we si Devid, I pughi ijekuru onye Filistia nka iluso ya ọ̀gù: n'ihi na nwata ka i bu, ma ya onwe-ya bu nwoke agha site na mb͕e ọ di na nwata.

34. Devid we si Sọl, Onye nāzùru nna-ya ìgwè ewu na aturu ka orù-gi buworo; ọdum we bia, ya na bear, we būpu nwa-aturu n'ìgwè aturu,

35. m'we pua so ya n'azu, tib͕ue ya, naputa nwa-aturu ahu n'ọnu-ya: o we bilie imegidem, m'we jide ya n'ọza-ya, tib͕ue ya, me ka ọ nwua.

36. Orù-gi tib͕uru ma ọdum ahu ma bear ahu: onye Filistia nka anēbìghi úgwù gādi kwa ka otù nime ha, n'ihi na ọ bu usoro-agha nile nke Chineke di ndu ka ọ taworo uta.

37. Devid we si, Jehova nke naputaram n'aka ọdum, na n'aka bear, Ya onwe-ya gānaputam n'aka onye Filistia nka. Sọl we si Devid, Je, Jehova gānọye-kwa-ra gi.

38. Sọl we yikwasi Devid uwe-nwuda-ya, kpukwasi okpu-agha ọla n'isi-ya, yikwasi ya uwe-agha.

39. Devid we kekwasi mma-agha-ya n'uwe-nwuda-ya, we jisie ike ije; n'ihi na ọ nwaghi ya. Devid we si Sọl, Apughm iwere ihe ndia je; n'ihi na anwaghm ha. Devid we yipu ha n'aru ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 17