Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 15:12-23 Bible Nso (IGBOB)

12. Samuel we bilie n'isi-ututu izute Sọl n'ututu; ewe gosi Samuel, si, Sọl biaruru Kamel, ma, le, ọ nēguzoro onwe-ya ihe-ncheta, o we je buruburu, gabiga, ridarue Gilgal.

13. Samuel we biakute Sọl: Sọl we si ya, Onye agọziri agọzi n'ebe Jehova nọ ka i bu: emewom ka okwu Jehova guzosie ike.

14. Samuel we si, Gini bu kwa olu ìgwè aturu na ewu a na ntim, ya na olu ìgwè ehi nke mu onwem nānu?

15. Sọl we si, Ọ bu n'etiti ndi Amalek ka ha si chita ha: n'ihi na ndi Israel nwere ọmiko n'aru anu kachasi nma nke ìgwè ewu na aturu na nke ìgwè ehi, ka ha we chuara Jehova, bú Chineke-gi, àjà; ma ayi ewezugawo nke fọduru ka ebibie ya.

16. Samuel we si Sọl, Ra aka, m'gēgosi kwa gi okwu nke Jehova gwaworom n'abali a. O we si ya, Kwue.

17. Samuel we si, Ọ bu ezie na onye ntà ka i bu n'anya gi onwe-gi, ma ọ̀ bughi onye-isi ebo nile nke Israel ka emere gi? Jehova we te gi manu ka i buru eze Israel;

18. Jehova we ziga gi ije ije, si, Je wezuga ndi-nmehie ahu, bú ndi Amalek, ka ebibie ha, i gēbuso kwa ha agha rue mb͕e agēme ka ha gwusia.

19. N'ìhi gini kwa ka i nēgeghi nti olu Jehova, kama i dakwasiri ihe-nkwata, we me ihe ọjọ n'anya Jehova?

20. Sọl we si Samuel, N'ezie egewom nti olu Jehova, we je ije ahu nke Jehova zigaram, m'we me ka Egag eze Amalek bia, ma ewezugaram Amalek ka ebibie ya.

21. Ma ndi Israel chiri ufọdu nime ihe-nkwata ichuru Jehova, bú Chineke-gi, àjà, nime Gilgal, bú ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, isi ihe n'ihe ewezugara ka ebibie ya.

22. Samuel we si, Àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ, hà nātọ Jehova utọ dika ige nti olu Jehova? Le, ige nti di nma kari ichu àjà, iṅa nti di nma kari abuba ebulu.

23. N'ihi na nmehie nke iju-ase n'aka ndi-mọ ka nnupu-isi bu, ikpere-arusi na terafim ka isi-ike bu kwa. N'ihi na i juwo okwu Jehova, Ọ juwo kwa gi ka i ghara ibu eze.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 15